Abụ Ọma 150 - Igbo 2020

← Books

Abụ Ọma

Igbo 2020
| 6 of 6 verses

1 Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3 Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5 werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.